Connect with us

NEWS

Onyeisi Ohaneze akpọkuola ndị Igbo ka ha laghachi azụ n’ọrụugbo

Published

on

ONYEISI Zuzugbe Ohaneze Ndigbo Ụwa niile gbaa gburugburu, Ambasadọ George Obiozor adụọla ndị Igbo ọdụ ka ha were ohere oge ọrụugbo a kọpụta nri n’ebe ọ dị ukwuu n’ala Igbo. Ọ rụtụrụ aka na dịka ọnọdụ siri dị n’oge a, na ihe gbasara ihe oriri dị oke mkpa.

  N’ozi ahụ ha zipụrụ, Odeakwụkwọ mgbasaozi otu ahụ n’ala anyị, Chiifu Alex Chiedozie Ogbonnia, n’aha Obiozor chetara mbọ ndị Igbo gbara n’ọrụugbo oge ọchịchị Dọkịnta Micheal Okpara.

  Ọ kọwara ọrụugbo dịka ihe dị oke mkpa ma baa ọtụtụ uru gụnyere ịkwalite ndịntorobịa site n’ime ka ha nwee ihe ha na-eme, ọ bụkwa ụzọ e si akpata ego, a na-ebufekwa ihe e nwetara n’ọrụugbo mba ụwa ndị ọzọ. O kwuru na ala ndị Igbo na-emepụta nri nke ọma nke mere na o kwesịrị na nri agaghị adị ụkọ n’ala Igbo.

  Ya mere, ọ kpọrọ ndị Igbo ka ha tinye uchu n’imepụta ihe oriri dịka ịzụ ehi, azụ, mmanụ nkwụ, kashu, akpụ w.d.g. N’oge mbụ, na e ji ehi Igbo kpọrọ ihe n’ihi ọnọdụ ya n’omenala Igbo. Oge eruola mgbe a ga-alaghachi azụ zụbakwa ehi Igbo.

  Ọ gara n’ihu kpọkuo ndị eze ọdịnala, ndịisi obodo, ndị ọnụ ruru n’okwu tinyere ndị Igbo bi mba ọzọ ka ha nye nkwado ha n’ihe gbasara ọrụugbo na imepụta erimeri n’ala Igbo, ọkachasị n’oge ọrụugbo a.

  Obiozor nabatara mbọ nke ndị steeti Anambra na Ebonyi na-agba n’ọrụugbo na imepụta erimeri. Ya mere, o kelere Gọvanọ Willie Obiano na Dave Umahi na ndị ọrụugbo niile nọ na steeti abụọ ahụ.

You May Also Like:-  Ndigbo not responsible for attack in Rivers police station - Ohaneze
Continue Reading
Advertisement
Click to comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *