Connect with us

NEWS

N’Anambra, ndị iwe juru obi agbaala onye zuru ohi ọkụ

Published

on

Ọ BỤNNỌỌ ihe anyammiri na ihe mgbawa obi, dịka ụfọdụ ụmụokorobịa iwe juru n’obi, jidere otu nwata nwoke a na-enyo ènyò na ọ bụ onyeohi, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo, ọkụ wee gbagbuo ya.

  Nnukwu ihe ọdachi ahụ bụ nke dapụtara na Nkpọr, dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ‘Idemili North’ nke steeti Anambra na nsonsoa.

  Ụfọdụ ndị ọnọmgbeomere kwùrù na ya bụ nwata nwoke á mághị onye ọ bụ, màrà otu onye aka àkpà, ma maghara handkachiifù ya, gbapụ ọsọ, chee na ọ bụ ego.

  Ndị ọnọmgbeomere ahụ mèrè ka a mara na ya bụ nwoke na ndị òtù ya nọ na mpaghara ụzọ ebe ahụ ezu ndị mmadụ ohi, na-ama ha aka àkpà, ma na-apụnarakwa ha ihe ha ji eme njem na mpaghara ụzọ Ọnịtsha ahụ.

 Ha mere ka a mara na onye ahụ nwata nwoke ahụ màrà aka àkpà nke ikpe azụ ahụ màlìtèrè tibe mkpu, nke mezịrị ka ndị mmadụ jiri gbata ọsọ n’ebe ahụ, wee jikọta onwe ha ọnụ, chụba onyeohi ahụ na ndị òtù ya ọsọ, dịka nkịta na-achụ nchì n’ọdọ ata.

  Ha chụgidere ma jide onyeohi ahụ, ebe ndị òtù ya ndị ọzọ riri mbọmbọ ọsọ. Ka ha jidechara ya, ha tiri ya gwoogwoo, ma gwa ya ka o kwuo ebe ndị òtù ya gara zoo, ka e wee ga nwụchikọọ ha niile, mana nwoke ahụ ekweghị agwa ha.

  Ka ha jụgidere ya ka ọ gwa ha, o wee jụ ịgwa ha; ndị ahụ jiri iwe tie ya ihe tinka tiri paanụ, wụọ ya mmanụ ọkụ, ma mụnye ya ọkụ ozigbo ozigbo; ọkụ wee gbagide ya, gbagide ya, ma gbagbuo ya.

You May Also Like:-  Youth devp: Anambra woos skills’trainers for support

  N’okwu ya banyere nke ahụ, onye na-ahụ maka mmekọrịta ọhaneze na ndị uweojii na steeti Anambra, bụ DSP Ikenga Toochukwu, onye kọwara etu ya bụ ihe siri wee mee, kwùrù na ihe ahụ bụ eziokwu, ma kọwaa na ha ebupùla ozu nwoke ahụ.

  Ọ kọwara na ọ bụ n’elekere iri na otu nke ụtụtụ ka ihe ahụ jiri mee, kwuo na ọ bụ na mpaghara njikọ ụzọ Nkpọr ka ya bụ ihe mere, ma kwuo na ha emeela ka ebe niile ahụ dị jụụ.

  Ọ katọrọ etu mmadụ si eji aka ha egbu mmadụ maọbụ na-eme ihe iwu akwadòghị maọbụ n’enwetaghị nkabi iwu, ma kwuo ka onye ọbụla jidere ndị ohi maọbụ onye omekoome mee ka ndị uweojii mara banyere nke ahụ, karịa iji aka ya na-eme ihe bụ uche ha n’ebe onye ahụ nọ.

  Ọ dị ncheta na o tèéla ndị aka àkpà, ndị otu nzuzo, ndị ohi, ndị wàyo, na ndị omekoome ndị ọzọ jiri yibe ndị mmadụ égwù n’Ọnịtsha nà ná mpaghara ebe ndị ọzọ dị na gburugburu ahụ (ọkachasị ndị bịara ọhụrụ, ndị na-eme njem, ndị machaghị ala ebe ahụ). Ha na-apụnarakwa onye nọ n’ime ụgbọala apị ekwentị ya maọbụ na-aza ekwentị, tinyere ọtụtụ ihe ọjọọ ndị ọzọ ha na-eme ebe ahụ.

  Nke a so n’otu ihe chuzịrị ọchịchị Gọvanọ Willie Obianọ oge ọ batara n’ọkwa ọchịchị, nke mezịrị o jiri wepụta atụmatụ nchekwa dị iche iche, dịka ‘Operation Kpochapụ’ (nke mbụ na nke abụọ), iji weta ya bụ ajọ ọnọdụ n’isi njedobe. N’agbanyeghị ihe niile ọchịchị Obianọ na ndị ọrụ nchekwa megoro na ezi mbọ ha gbagoro iji memilaa akparamagwa ọjọọ ahụ a na-ahụta n’Ọnịtsha; ụfọdụ ndị ọjọọ ahụ fooro ntutu taa, sị na ha agaghị esepu aka n’ime mpụ, bụkwazị nke mere ndị mmadụ jizịrị malite ime ha ‘e jide, e gbuo’ n’ebe ndị a, maka na ọ na-abụ anụ gbaba ebeghị ebe, dịnta agbaba atụghị atụ.

This error message is only visible to WordPress admins
You May Also Like:-  Help promote good leadership – Ibezim tells youths

Error 403: The request cannot be completed because you have exceeded your quota..

Domain code: youtube.quota
Reason code: quotaExceeded

Error: No feed found with the ID .

Go to the All Feeds page and select an ID from an existing feed.

Continue Reading
Advertisement
Click to comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *